Native Bible

1 Kings 5:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Solomọn zigara Hiram ozi, sị ya:

1 Kings 5:2 in English

1 Kings 5:2 · Berean Standard Bible

And Solomon relayed this message to Hiram:

Context

1Mgbe Hiram eze Taịa* nụrụ na eteela Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ nna ya Devid, o zipụrụ ndị ozi ya ijekwuru Solomọn, nʼihi na ya na Devid bụ enyi, dịrịkwa na mma. 2Mgbe ahụ, Solomọn zigara Hiram ozi, sị ya: 3“Ị maara na Devid nna m enweghị ike iwu ụlọnsọ ukwuu nye Aha Onyenwe anyị Chineke ya, nʼihi agha niile ọ lụrụ mgbe ọ dị ndụ.* Ọ nọkwa na-eche ka Onyenwe anyị nye ya udo. 4Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke m enyela m udo nʼakụkụ ọbụla. Enwekwaghị m ndị iro, ma ọ bụkwanụ ihe ndakwasị ọjọọ ọbụla.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.