Native Bible

1 Kings 4:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe oriri a na-ewebata nʼụlọ Solomọn ụbọchị niile bụ otu narị bushel ụtụ ọka na iri bushel asatọ, na iri akpa ọka a kwọrọ akwọ isii,

1 Kings 4:22 in English

1 Kings 4:22 · Berean Standard Bible

Solomon’s provisions for a single day were thirty cors of fine flour,* sixty cors of meal,*

Context

20Nʼoge a, ndị Juda na Izrel bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ha na-eri na-aṅụ, na-emekwa onwe ha obi ụtọ. 21Ala niile Solomọn na-achị sitere nʼoke osimiri Yufretis ruo ala ndị Filistia, rukwaa nʼoke ala ndị Ijipt.* Ndị niile a lụgburu nʼagha nʼobodo ndị a na-atụta ụtụ ha na-enye Solomọn. Ha nọgidekwara nʼokpuru Solomọn ụbọchị niile nke ndụ ya. 22Ihe oriri a na-ewebata nʼụlọ Solomọn ụbọchị niile bụ otu narị bushel ụtụ ọka na iri bushel asatọ, na iri akpa ọka a kwọrọ akwọ isii, 23na ehi iri mara abụba, na iri ehi abụọ a zụrụ nʼebe a na-azụ anụ, na narị atụrụ na ewu. A gụnyeghị anụ ele na mgbada na oke ele na ọkụkọ ọma* a na-ewebata. 24Nʼihi na ọ chịrị alaeze niile a ruo nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis, site na Tifsa ruo na Gaza.* O nwekwara udo nʼakụkụ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.