Native Bible

1 Kings 4:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọ chịrị alaeze niile a ruo nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis, site na Tifsa ruo na Gaza.* O nwekwara udo nʼakụkụ niile.

1 Kings 4:24 in English

1 Kings 4:24 · Berean Standard Bible

For Solomon had dominion over everything west of the Euphrates *—over all the kingdoms from Tiphsah to Gaza—and he had peace on all sides.

Context

22Ihe oriri a na-ewebata nʼụlọ Solomọn ụbọchị niile bụ otu narị bushel ụtụ ọka na iri bushel asatọ, na iri akpa ọka a kwọrọ akwọ isii, 23na ehi iri mara abụba, na iri ehi abụọ a zụrụ nʼebe a na-azụ anụ, na narị atụrụ na ewu. A gụnyeghị anụ ele na mgbada na oke ele na ọkụkọ ọma* a na-ewebata. 24Nʼihi na ọ chịrị alaeze niile a ruo nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis, site na Tifsa ruo na Gaza.* O nwekwara udo nʼakụkụ niile. 25Nʼoge ndụ Solomọn niile, Juda na Izrel site na Dan ruo Bịasheba bi nʼudo. Nwoke ọbụla nọ nʼokpuru osisi vaịnị na nʼokpuru osisi fiig nke ya.* 26Ọnụọgụgụ ụlọ a na-etinye ụgbọ agha ịnyịnya na-adọkpụ nke Solomọn nwere dị puku anọ. Ọnụọgụgụ ịnyịnya a na-agba agba o nwere dị puku iri na abụọ.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.