1 Ndị Eze 22:47
1 Kings 22:47 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge a, eze adịghị nʼala Edọm, kama ọ bụ onye nnọchite anya eze bụ onye na-achị.
1 Kings 22:47 in English
1 Kings 22:47 · Berean Standard Bible
And there was no king in Edom; a deputy served as king.
Context
45Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Jehoshafat, ihe niile ndị ọ rụpụtara, ike ọ kpara nʼọtụtụ agha nke o buru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 46O kpochapụrụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị, bụ ndị nke fọdụrụ, mgbe nna ya bụ Asa chịchara ọchịchị. 47Nʼoge a, eze adịghị nʼala Edọm, kama ọ bụ onye nnọchite anya eze bụ onye na-achị. 48Jehoshafat wuuru ọtụtụ ụgbọ mmiri eji azụ ahịa, maka ije nʼala Ọfịa ịga bute ọlaedo ma ụgbọ mmiri ndị a agaghị ebe ọbụla, nʼihi na ha mikpuru nʼEziọn Geba. 49Nʼoge ahụ, Ahazaya nwa Ehab sịrị Jehoshafat, “Kwere ka ndị ikom m soro ndị ọrụ gị nʼụgbọ gị,” ma Jehoshafat ekweghị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.