Native Bible

1 Kings 22:48 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jehoshafat wuuru ọtụtụ ụgbọ mmiri eji azụ ahịa, maka ije nʼala Ọfịa ịga bute ọlaedo ma ụgbọ mmiri ndị a agaghị ebe ọbụla, nʼihi na ha mikpuru nʼEziọn Geba.

1 Kings 22:48 in English

1 Kings 22:48 · Berean Standard Bible

Jehoshaphat built ships of Tarshish * to go to Ophir for gold, but they never set sail, because they were wrecked at Ezion-geber.

Context

46O kpochapụrụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị, bụ ndị nke fọdụrụ, mgbe nna ya bụ Asa chịchara ọchịchị. 47Nʼoge a, eze adịghị nʼala Edọm, kama ọ bụ onye nnọchite anya eze bụ onye na-achị. 48Jehoshafat wuuru ọtụtụ ụgbọ mmiri eji azụ ahịa, maka ije nʼala Ọfịa ịga bute ọlaedo ma ụgbọ mmiri ndị a agaghị ebe ọbụla, nʼihi na ha mikpuru nʼEziọn Geba. 49Nʼoge ahụ, Ahazaya nwa Ehab sịrị Jehoshafat, “Kwere ka ndị ikom m soro ndị ọrụ gị nʼụgbọ gị,” ma Jehoshafat ekweghị. 50Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid, nna ya. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.