1 Ndị Eze 21:17
1 Kings 21:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe, sị ya,
1 Kings 21:17 in English
1 Kings 21:17 · Berean Standard Bible
Then the word of the LORD came to Elijah the Tishbite, saying,
Context
15Ngwangwa Jezebel natara ozi na a tụgbola Nebọt, ọ sịrị Ehab, “Bilie, gaa nwetara onwe gị ubi vaịnị Nebọt, nwoke onye Jezril. Ubi ahụ ọ jụrụ inye gị nʼego abụrụla nke gị ugbu a nʼihi na Nebọt anwụọla. Ọ dịkwaghị ndụ ọzọ!” 16Mgbe Ehab nụrụ na Nebọt anwụọla, o biliri pụọ, gaa ịbanye nʼubi ahụ, inwetara onwe ya ubi vaịnị Nebọt, onye Jezril. 17Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe, sị ya, 18“Bilie, gaa zute Ehab, eze Izrel onye bi na Sameria. Ọ nọ ugbu a nʼime ubi vaịnị Nebọt inwetara ya onwe ya. 19Gwa ya sị ya, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: I gbuola ọchụ mmadụ si otu a nwetara onwe gị ihe nketa? Ebe ahụ nkịta nọ rachaa ọbara Nebọt ka ha ga-anọ rachaakwa ọbara gị. E, ọbara gị onwe gị.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.