Native Bible

1 Kings 21:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ngwangwa Jezebel natara ozi na a tụgbola Nebọt, ọ sịrị Ehab, “Bilie, gaa nwetara onwe gị ubi vaịnị Nebọt, nwoke onye Jezril. Ubi ahụ ọ jụrụ inye gị nʼego abụrụla nke gị ugbu a nʼihi na Nebọt anwụọla. Ọ dịkwaghị ndụ ọzọ!”

1 Kings 21:15 in English

1 Kings 21:15 · Berean Standard Bible

When Jezebel heard that Naboth had been stoned to death, she said to Ahab, “Get up and take possession of the vineyard of Naboth the Jezreelite, who refused to give it to you for silver. For Naboth is no longer alive, but dead.”

Context

13Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ na-abaghị uru pụtakwara, nọdụ na ncherita ihu ya, ha gbara ama ụgha megide Nebọt, nʼihu ndị mmadụ, sị, “Nebọt kọchara Chineke na eze.” Nʼihi nke a, ha dọkpụụrụ ya gaa nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya. 14Emesịa, ndị okenye na ndị a maara aha ha nke obodo Jezril, ziri ozi zigara Jezebel gwa ya na Nebọt anwụọla. 15Ngwangwa Jezebel natara ozi na a tụgbola Nebọt, ọ sịrị Ehab, “Bilie, gaa nwetara onwe gị ubi vaịnị Nebọt, nwoke onye Jezril. Ubi ahụ ọ jụrụ inye gị nʼego abụrụla nke gị ugbu a nʼihi na Nebọt anwụọla. Ọ dịkwaghị ndụ ọzọ!” 16Mgbe Ehab nụrụ na Nebọt anwụọla, o biliri pụọ, gaa ịbanye nʼubi ahụ, inwetara onwe ya ubi vaịnị Nebọt, onye Jezril. 17Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe, sị ya,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.