Native Bible

1 Kings 21:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gwa ya sị ya, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: I gbuola ọchụ mmadụ si otu a nwetara onwe gị ihe nketa? Ebe ahụ nkịta nọ rachaa ọbara Nebọt ka ha ga-anọ rachaakwa ọbara gị. E, ọbara gị onwe gị.’ ”

1 Kings 21:19 in English

1 Kings 21:19 · Berean Standard Bible

Tell him that this is what the LORD says: ‘Have you not murdered a man and seized his land?’ Then tell him that this is also what the LORD says: ‘In the place where the dogs licked up the blood of Naboth, there also the dogs will lick up your blood—yes, yours!’*”

Context

17Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe, sị ya, 18“Bilie, gaa zute Ehab, eze Izrel onye bi na Sameria. Ọ nọ ugbu a nʼime ubi vaịnị Nebọt inwetara ya onwe ya. 19Gwa ya sị ya, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: I gbuola ọchụ mmadụ si otu a nwetara onwe gị ihe nketa? Ebe ahụ nkịta nọ rachaa ọbara Nebọt ka ha ga-anọ rachaakwa ọbara gị. E, ọbara gị onwe gị.’ ” 20Mgbe ahụ, Ehab jụrụ Ịlaịja ajụjụ sị ya, “Onye iro m, ị chọrọkwala m bịa?” Ịlaịja zara sị ya, “E, achọrọla m gị bịa nʼihi nnyefe i nyefere onwe gị ime ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. 21Ọ sịrị, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ dakwasị gị. Aga m ekpochapụ ndị agbụrụ gị, site nʼezinaụlọ Ehab bipụ nwoke ọbụla, maọbụ ohu maọbụ onyenwe onwe ya nʼIzrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.