1 Ndị Eze 2:8
1 Kings 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Cheta Shimei, nwa Gera, onye Benjamin ahụ bi nʼobodo Bahurim, onye kọchara m nkọcha jọgburu onwe ya nʼụbọchị ahụ m jere Mahanaim. Mgbe ọ bịara izute m na Jọdan, eji m aha Onyenwe anyị ṅụọrọ ya iyi sị ya, ‘Agaghị m eji mma agha gbuo gị.’
1 Kings 2:8 in English
1 Kings 2:8 · Berean Standard Bible
Keep an eye on Shimei the son of Gera, the Benjamite from Bahurim who is with you. He called down bitter curses against me on the day I went to Mahanaim, but when he came down to meet me at the Jordan, I swore to him by the LORD: ‘I will never put you to the sword.’
Context
6Ị bụ nwoke maara ihe, ị makwaara ihe ị ga-eme. Ekwela ka Joab, nʼagbanyeghị isi awọ ya, nwụọ nʼudo. 7“Ma meere ụmụ Bazilai onye Gilead ebere. Meekwa ka ha bụrụ ndị na-eso gị rie ihe na tebul gị nʼihi na ha ji obi ha zute m mgbe m na-agba ọsọ ndụ nʼihi nwanne gị Absalọm. 8“Cheta Shimei, nwa Gera, onye Benjamin ahụ bi nʼobodo Bahurim, onye kọchara m nkọcha jọgburu onwe ya nʼụbọchị ahụ m jere Mahanaim. Mgbe ọ bịara izute m na Jọdan, eji m aha Onyenwe anyị ṅụọrọ ya iyi sị ya, ‘Agaghị m eji mma agha gbuo gị.’ 9Ma achọghị m ka ị hapụ ya dịka onye ikpe na-amaghị. Ị bụ nwoke maara ihe. Ị makwaara ihe ị ga-eme ya. Mee ka o jiri isi awọ ọbara juru baa nʼili.” 10Emesịa, Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. E liri ya na obodo Devid.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.