Native Bible

1 Kings 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị bụ nwoke maara ihe, ị makwaara ihe ị ga-eme. Ekwela ka Joab, nʼagbanyeghị isi awọ ya, nwụọ nʼudo.

1 Kings 2:6 in English

1 Kings 2:6 · Berean Standard Bible

So act according to your wisdom, and do not let his gray head go down to Sheol in peace.

Context

4Ka Onyenwe anyị mezuo nkwa o kwere banyere m, sị ‘Ọ bụrụ na ụmụ gị na ụmụ ụmụ ha elezie anya nʼotu ha si ebi ndụ, ọ bụrụ na ha ejegharịa nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi nʼihu m, jiri obi ha niile na mkpụrụobi ha mee nke a, ị gaghị achọ onye ga-anọkwasị nʼoche eze Izrel achọ.’ 5“Ugbu a, gị onwe gị maara ihe Joab nwa Zeruaya mere m, ya bụ ihe o mere mmadụ abụọ bụ ndịisi agha Izrel, Abna nwa Nea, na Amasa nwa Jeta. O gburu ha, wufuo ọbara ha nʼoge udo, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe e mere nʼagha. O jikwa ọbara ahụ merụọ ihe okike o kere nʼukwu na akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ. 6Ị bụ nwoke maara ihe, ị makwaara ihe ị ga-eme. Ekwela ka Joab, nʼagbanyeghị isi awọ ya, nwụọ nʼudo. 7“Ma meere ụmụ Bazilai onye Gilead ebere. Meekwa ka ha bụrụ ndị na-eso gị rie ihe na tebul gị nʼihi na ha ji obi ha zute m mgbe m na-agba ọsọ ndụ nʼihi nwanne gị Absalọm. 8“Cheta Shimei, nwa Gera, onye Benjamin ahụ bi nʼobodo Bahurim, onye kọchara m nkọcha jọgburu onwe ya nʼụbọchị ahụ m jere Mahanaim. Mgbe ọ bịara izute m na Jọdan, eji m aha Onyenwe anyị ṅụọrọ ya iyi sị ya, ‘Agaghị m eji mma agha gbuo gị.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.