1 Ndị Eze 2:10
1 Kings 2:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. E liri ya na obodo Devid.
1 Kings 2:10 in English
1 Kings 2:10 · Berean Standard Bible
Then David rested with his fathers and was buried in the City of David.
Context
8“Cheta Shimei, nwa Gera, onye Benjamin ahụ bi nʼobodo Bahurim, onye kọchara m nkọcha jọgburu onwe ya nʼụbọchị ahụ m jere Mahanaim. Mgbe ọ bịara izute m na Jọdan, eji m aha Onyenwe anyị ṅụọrọ ya iyi sị ya, ‘Agaghị m eji mma agha gbuo gị.’ 9Ma achọghị m ka ị hapụ ya dịka onye ikpe na-amaghị. Ị bụ nwoke maara ihe. Ị makwaara ihe ị ga-eme ya. Mee ka o jiri isi awọ ọbara juru baa nʼili.” 10Emesịa, Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. E liri ya na obodo Devid. 11Ma ọ chịrị Izrel iri afọ anọ; ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem. 12Solomọn nọdụrụ nʼocheeze nna ya Devid dịka eze. Alaeze ya guzosiri ike nke ukwuu. Ọchịchị ya gakwara nke ọma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.