Native Bible

1 Kings 2:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma eze Solomọn ga-abụ onye a gọziri agọzi. Ocheeze Devid ga-eguzosikwa ike nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”

1 Kings 2:45 in English

1 Kings 2:45 · Berean Standard Bible

But King Solomon will be blessed and David’s throne will remain secure before the LORD forever.”

Context

43Ọ bụ gịnị mere i ji mebie iyi ị ṅụrụ nye Onyenwe anyị, jụkwa idebe ihe m nyere gị nʼiwu?” 44Eze gwakwara Shimei okwu sị ya, “I maara ihe ọjọọ* niile i mere megide nna m Devid. Ugbu a Onyenwe anyị ga-akwụghachi gị ụgwọ nʼihi omume ọjọọ gị. 45Ma eze Solomọn ga-abụ onye a gọziri agọzi. Ocheeze Devid ga-eguzosikwa ike nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.” 46Mgbe ahụ, eze nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu ka o gbuo Shimei. Ọ pụkwara tituo ya, ọ nwụọ. Sitekwa nʼoge ahụ, alaeze Solomọn guzosiri ike nʼaka ya. 2:19 Nʼụlọeze mba ndị dị nʼọwụwa anyanwụ, nne eze bụ onye a na-asọpụrụ. A na-enyekwa ya ọrụ ụfọdụ ka ọ rụọ, i ji kwanyere ya ugwu. 2:26 Anatot, bụ otu nʼime obodo nke ebo Benjamin nyere ndị nchụaja Jos 21:18; Jer 1:1 2:27 Ọ bụ naanị Abịata gbapụrụ mgbe a na-egbu ndị ezinaụlọ Elayị. 1Sa 22:17-20 2:27 1Sa 2:27-36 2:34 Nʼoge ochie, nʼihi na-enweghị ebe ili ozu nke ozuzu ọha, a na-eli onye ọbụla nʼala nke aka ya. 2:39 Obodo Gat dị na Filistia. 2:44 2Sa 16:5-13

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.