Native Bible

1 Kings 2:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze gwakwara Shimei okwu sị ya, “I maara ihe ọjọọ* niile i mere megide nna m Devid. Ugbu a Onyenwe anyị ga-akwụghachi gị ụgwọ nʼihi omume ọjọọ gị.

1 Kings 2:44 in English

1 Kings 2:44 · Berean Standard Bible

The king also said, “You know in your heart all the evil that you did to my father David. Therefore the LORD will bring your evil back upon your head.

Context

42eze ziri ozi kpọọ Shimei sị ya, “Ọ bụ na m adọghị gị aka na ntị, jiri aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, ‘Mara nke ọma nʼụbọchị ọbụla ị ga-esi nʼebe a pụọ gaa nʼebe ọbụla ọzọ, na ị ga-anwụ?’ Nʼoge ahụ, ị zara m sị m, ‘Okwu gị dị mma. Aga m emekwa ya.’ 43Ọ bụ gịnị mere i ji mebie iyi ị ṅụrụ nye Onyenwe anyị, jụkwa idebe ihe m nyere gị nʼiwu?” 44Eze gwakwara Shimei okwu sị ya, “I maara ihe ọjọọ* niile i mere megide nna m Devid. Ugbu a Onyenwe anyị ga-akwụghachi gị ụgwọ nʼihi omume ọjọọ gị. 45Ma eze Solomọn ga-abụ onye a gọziri agọzi. Ocheeze Devid ga-eguzosikwa ike nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.” 46Mgbe ahụ, eze nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu ka o gbuo Shimei. Ọ pụkwara tituo ya, ọ nwụọ. Sitekwa nʼoge ahụ, alaeze Solomọn guzosiri ike nʼaka ya. 2:19 Nʼụlọeze mba ndị dị nʼọwụwa anyanwụ, nne eze bụ onye a na-asọpụrụ. A na-enyekwa ya ọrụ ụfọdụ ka ọ rụọ, i ji kwanyere ya ugwu. 2:26 Anatot, bụ otu nʼime obodo nke ebo Benjamin nyere ndị nchụaja Jos 21:18; Jer 1:1 2:27 Ọ bụ naanị Abịata gbapụrụ mgbe a na-egbu ndị ezinaụlọ Elayị. 1Sa 22:17-20 2:27 1Sa 2:27-36 2:34 Nʼoge ochie, nʼihi na-enweghị ebe ili ozu nke ozuzu ọha, a na-eli onye ọbụla nʼala nke aka ya. 2:39 Obodo Gat dị na Filistia. 2:44 2Sa 16:5-13

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.