1 Ndị Eze 2:40
1 Kings 2:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a mere ka o bilie, rịkwasị nʼelu ịnyịnya ibu ya, gaa Gat, jekwuru Akish nʼihi ịchọ ndị ohu ya. Shimei gara mee ka ndị ohu ya soro ya laghachite azụ.
1 Kings 2:40 in English
1 Kings 2:40 · Berean Standard Bible
So Shimei saddled his donkey and set out to Achish at Gath in search of his slaves, and he brought them back from Gath.
Context
38Shimei zara eze, “Okwu gị dị mma. Ohu gị ga-eme dịka onyenwe m bụ eze kwuru.” Shimei biiri nʼime Jerusalem, nọọkwa ọtụtụ ụbọchị. 39Ma nʼọgwụgwụ afọ atọ, ndị ohu abụọ Shimei nwere gbapụrụ ọsọ gbakwuru Akish, nwa Maaka, eze Gat.* Ndị mmadụ bịara gwa Shimei sị ya, “Lee, ndị ohu gị nọ na Gat.” 40Nke a mere ka o bilie, rịkwasị nʼelu ịnyịnya ibu ya, gaa Gat, jekwuru Akish nʼihi ịchọ ndị ohu ya. Shimei gara mee ka ndị ohu ya soro ya laghachite azụ. 41Mgbe a gwara Solomọn na Shimei hapụrụ Jerusalem gaa Gat ma lọghachikwa azụ, 42eze ziri ozi kpọọ Shimei sị ya, “Ọ bụ na m adọghị gị aka na ntị, jiri aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, ‘Mara nke ọma nʼụbọchị ọbụla ị ga-esi nʼebe a pụọ gaa nʼebe ọbụla ọzọ, na ị ga-anwụ?’ Nʼoge ahụ, ị zara m sị m, ‘Okwu gị dị mma. Aga m emekwa ya.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.