Native Bible

1 Kings 2:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe a gwara Solomọn na Shimei hapụrụ Jerusalem gaa Gat ma lọghachikwa azụ,

1 Kings 2:41 in English

1 Kings 2:41 · Berean Standard Bible

When Solomon was told that Shimei had gone from Jerusalem to Gath and had returned,

Context

39Ma nʼọgwụgwụ afọ atọ, ndị ohu abụọ Shimei nwere gbapụrụ ọsọ gbakwuru Akish, nwa Maaka, eze Gat.* Ndị mmadụ bịara gwa Shimei sị ya, “Lee, ndị ohu gị nọ na Gat.” 40Nke a mere ka o bilie, rịkwasị nʼelu ịnyịnya ibu ya, gaa Gat, jekwuru Akish nʼihi ịchọ ndị ohu ya. Shimei gara mee ka ndị ohu ya soro ya laghachite azụ. 41Mgbe a gwara Solomọn na Shimei hapụrụ Jerusalem gaa Gat ma lọghachikwa azụ, 42eze ziri ozi kpọọ Shimei sị ya, “Ọ bụ na m adọghị gị aka na ntị, jiri aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, ‘Mara nke ọma nʼụbọchị ọbụla ị ga-esi nʼebe a pụọ gaa nʼebe ọbụla ọzọ, na ị ga-anwụ?’ Nʼoge ahụ, ị zara m sị m, ‘Okwu gị dị mma. Aga m emekwa ya.’ 43Ọ bụ gịnị mere i ji mebie iyi ị ṅụrụ nye Onyenwe anyị, jụkwa idebe ihe m nyere gị nʼiwu?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.