1 Ndị Eze 2:38
1 Kings 2:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Shimei zara eze, “Okwu gị dị mma. Ohu gị ga-eme dịka onyenwe m bụ eze kwuru.” Shimei biiri nʼime Jerusalem, nọọkwa ọtụtụ ụbọchị.
1 Kings 2:38 in English
1 Kings 2:38 · Berean Standard Bible
“The sentence is fair,” Shimei replied. “Your servant will do as my lord the king has spoken.” And Shimei lived in Jerusalem for a long time.
Context
36Emesịa, eze ziri Shimei ozi sị ya, “wuoro onwe gị ụlọ na Jerusalem, biri nʼebe ahụ, esitekwala nʼebe ahụ pụọ jee ebe ọbụla. 37Nʼihi na ụbọchị ị ga-apụ gafee iyi dị na Ndagwurugwu Kidrọn, mara nke ọma na ị ghaghị ịnwụ. Ọbara gị ga-adịkwa gị nʼisi.” 38Shimei zara eze, “Okwu gị dị mma. Ohu gị ga-eme dịka onyenwe m bụ eze kwuru.” Shimei biiri nʼime Jerusalem, nọọkwa ọtụtụ ụbọchị. 39Ma nʼọgwụgwụ afọ atọ, ndị ohu abụọ Shimei nwere gbapụrụ ọsọ gbakwuru Akish, nwa Maaka, eze Gat.* Ndị mmadụ bịara gwa Shimei sị ya, “Lee, ndị ohu gị nọ na Gat.” 40Nke a mere ka o bilie, rịkwasị nʼelu ịnyịnya ibu ya, gaa Gat, jekwuru Akish nʼihi ịchọ ndị ohu ya. Shimei gara mee ka ndị ohu ya soro ya laghachite azụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.