1 Ndị Eze 2:34
1 Kings 2:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Benaya nwa Jehoiada gara gbuo Joab. E liri ya nʼala nke ya* dị nʼọzara.
1 Kings 2:34 in English
1 Kings 2:34 · Berean Standard Bible
So Benaiah son of Jehoiada went up, struck down Joab, and killed him. He was buried at his own home in the wilderness.
Context
32Onyenwe anyị ga-emekwa ka ọbara ọ wụsiri laa ya nʼisi, nʼihi na o ji mma agha gbuo ndị ikom abụọ, ma nna m Devid amaghị maka ya. Ha abụọ, ya bụ Abna nwa Nea, ọchịagha ndị Izrel, na Amasa nwa Jeta, ọchịagha ndị Juda, ndị dị mma ma bụrụkwa ndị ezi omume karịa ya. 33Ka ikpe ọmụma dị nʼihi igbu ọchụ ndị a dịkwasị Joab na ụmụ ụmụ ya nʼisi ruo mgbe ebighị ebi. Ma nʼebe Devid na ụmụ ụmụ ya, na ụlọ ya, na ocheeze ya dị, ka udo Onyenwe anyị dịkwasị ha ruo mgbe ebighị ebi.” 34Benaya nwa Jehoiada gara gbuo Joab. E liri ya nʼala nke ya* dị nʼọzara. 35Mgbe ahụ, eze họpụtara Benaya, nwa Jehoiada ka ọ bụrụ onyeisi ndị agha ya niile, ma mee Zadọk onye nchụaja nʼọnọdụ Abịata. 36Emesịa, eze ziri Shimei ozi sị ya, “wuoro onwe gị ụlọ na Jerusalem, biri nʼebe ahụ, esitekwala nʼebe ahụ pụọ jee ebe ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.