Native Bible

1 Kings 2:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị ga-emekwa ka ọbara ọ wụsiri laa ya nʼisi, nʼihi na o ji mma agha gbuo ndị ikom abụọ, ma nna m Devid amaghị maka ya. Ha abụọ, ya bụ Abna nwa Nea, ọchịagha ndị Izrel, na Amasa nwa Jeta, ọchịagha ndị Juda, ndị dị mma ma bụrụkwa ndị ezi omume karịa ya.

1 Kings 2:32 in English

1 Kings 2:32 · Berean Standard Bible

The LORD will bring his bloodshed back upon his own head, for without the knowledge of my father David he struck down two men more righteous and better than he when he put to the sword Abner son of Ner, commander of Israel’s army, and Amasa son of Jether, commander of Judah’s army.

Context

30Benaya banyere nʼime ụlọ nzute Onyenwe anyị, sị Joab, “Eze sị gị, ‘pụta ezi!’ ” Ma ọ zara, “Mba, aga m anwụ nʼebe a.” Nʼihi nke a, Benaya jekwuru eze gwa ya ihe Joab kwuru. 31Mgbe ahụ, eze nyere Benaya iwu sị ya, “Gaa mee dịka o kwuru. Gbuo ya, liekwa ya. Nke a ga-eme ka ikpe ọmụma ghara ịdịrị mụ na ezinaụlọ nna m Devid nʼihi ikpe ọmụma dịrị Joab maka ọbara ndị aka ha dị ọcha ọ wụsiri. 32Onyenwe anyị ga-emekwa ka ọbara ọ wụsiri laa ya nʼisi, nʼihi na o ji mma agha gbuo ndị ikom abụọ, ma nna m Devid amaghị maka ya. Ha abụọ, ya bụ Abna nwa Nea, ọchịagha ndị Izrel, na Amasa nwa Jeta, ọchịagha ndị Juda, ndị dị mma ma bụrụkwa ndị ezi omume karịa ya. 33Ka ikpe ọmụma dị nʼihi igbu ọchụ ndị a dịkwasị Joab na ụmụ ụmụ ya nʼisi ruo mgbe ebighị ebi. Ma nʼebe Devid na ụmụ ụmụ ya, na ụlọ ya, na ocheeze ya dị, ka udo Onyenwe anyị dịkwasị ha ruo mgbe ebighị ebi.” 34Benaya nwa Jehoiada gara gbuo Joab. E liri ya nʼala nke ya* dị nʼọzara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.