Native Bible

1 Kings 2:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Benaya banyere nʼime ụlọ nzute Onyenwe anyị, sị Joab, “Eze sị gị, ‘pụta ezi!’ ” Ma ọ zara, “Mba, aga m anwụ nʼebe a.” Nʼihi nke a, Benaya jekwuru eze gwa ya ihe Joab kwuru.

1 Kings 2:30 in English

1 Kings 2:30 · Berean Standard Bible

And Benaiah entered the tent of the LORD and said to Joab, “The king says, ‘Come out!’” But Joab replied, “No, I will die here.” So Benaiah relayed the message to the king, saying, “This is how Joab answered me.”

Context

28Ma mgbe Joab nụrụ na Adonaịja anwụọla, ọ gbaara ọsọ gaa nʼụlọ nzute Onyenwe anyị jigide mpi dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja aka. Ọ bụ ezie na Joab so Adonaịja gbaa izu imegide Solomọn, ma o soghị Absalọm gbaa izu imegide Devid. 29Mgbe a gwara eze Solomọn, na Joab a gbabala nʼụlọ ikwu Onyenwe anyị, nọdụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja. Solomọn nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu sị, “Gaa, tituo ya nʼala.” 30Benaya banyere nʼime ụlọ nzute Onyenwe anyị, sị Joab, “Eze sị gị, ‘pụta ezi!’ ” Ma ọ zara, “Mba, aga m anwụ nʼebe a.” Nʼihi nke a, Benaya jekwuru eze gwa ya ihe Joab kwuru. 31Mgbe ahụ, eze nyere Benaya iwu sị ya, “Gaa mee dịka o kwuru. Gbuo ya, liekwa ya. Nke a ga-eme ka ikpe ọmụma ghara ịdịrị mụ na ezinaụlọ nna m Devid nʼihi ikpe ọmụma dịrị Joab maka ọbara ndị aka ha dị ọcha ọ wụsiri. 32Onyenwe anyị ga-emekwa ka ọbara ọ wụsiri laa ya nʼisi, nʼihi na o ji mma agha gbuo ndị ikom abụọ, ma nna m Devid amaghị maka ya. Ha abụọ, ya bụ Abna nwa Nea, ọchịagha ndị Izrel, na Amasa nwa Jeta, ọchịagha ndị Juda, ndị dị mma ma bụrụkwa ndị ezi omume karịa ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.