1 Ndị Eze 2:21
1 Kings 2:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere ọ sịrị, “Biko, kwere ka enye nwanne gị nwoke Adonaịja Abishag nwanyị Shunem, ka ọ bụrụ nwunye ya.”
1 Kings 2:21 in English
1 Kings 2:21 · Berean Standard Bible
So Bathsheba said, “Let Abishag the Shunammite be given to your brother Adonijah as his wife.”
Context
19Emesịa, Batsheba bịakwutere eze Solomọn ịgwa ya okwu banyere Adonaịja. Mgbe ọ na-abata, eze sitere nʼocheeze ya bilie gaa izute ya, kpọkwaa isiala nye ya nọdụ ala nʼocheeze ya. O mere ka e butere nne eze* ocheeze, ọ nọdụkwara ala nʼaka nri ya. 20Ọ sịrị, “Enwere m arịrịọ nta m chọrọ ịrịọ gị. Ajụkwala i mere m ya.”
Eze zaghachiri, “Rịọọ ya nne m. Agaghị m ajụ i mere gị ya.” 21Ya mere ọ sịrị, “Biko, kwere ka enye nwanne gị nwoke Adonaịja Abishag nwanyị Shunem, ka ọ bụrụ nwunye ya.” 22Eze Solomọn zara nne ya sị, “Gịnị mere i ji rịọọ m ka m nye Adonaịja naanị Abishag nwanyị Shunem ka ọ bụrụ nwunye ya? Ị gaara arịọkwa m sị m nye ya alaeze m. Nʼihi na ọ bụ ya tọrọ m” Ị gaara arịọkwa nʼihi Abịata onye nchụaja ma Joab nwa Zeruaya. 23Mgbe ahụ, eze Solomọn ji Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na Adonaịja ejighị ndụ ya kwụọ ụgwọ nʼihi arịrịọ a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.