Native Bible

1 Kings 2:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze Solomọn zara nne ya sị, “Gịnị mere i ji rịọọ m ka m nye Adonaịja naanị Abishag nwanyị Shunem ka ọ bụrụ nwunye ya? Ị gaara arịọkwa m sị m nye ya alaeze m. Nʼihi na ọ bụ ya tọrọ m” Ị gaara arịọkwa nʼihi Abịata onye nchụaja ma Joab nwa Zeruaya.

1 Kings 2:22 in English

1 Kings 2:22 · Berean Standard Bible

King Solomon answered his mother, “Why do you request Abishag the Shunammite for Adonijah? Since he is my older brother, you might as well request the kingdom for him and for Abiathar the priest and for Joab son of Zeruiah!”

Context

20Ọ sịrị, “Enwere m arịrịọ nta m chọrọ ịrịọ gị. Ajụkwala i mere m ya.” Eze zaghachiri, “Rịọọ ya nne m. Agaghị m ajụ i mere gị ya.” 21Ya mere ọ sịrị, “Biko, kwere ka enye nwanne gị nwoke Adonaịja Abishag nwanyị Shunem, ka ọ bụrụ nwunye ya.” 22Eze Solomọn zara nne ya sị, “Gịnị mere i ji rịọọ m ka m nye Adonaịja naanị Abishag nwanyị Shunem ka ọ bụrụ nwunye ya? Ị gaara arịọkwa m sị m nye ya alaeze m. Nʼihi na ọ bụ ya tọrọ m” Ị gaara arịọkwa nʼihi Abịata onye nchụaja ma Joab nwa Zeruaya. 23Mgbe ahụ, eze Solomọn ji Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na Adonaịja ejighị ndụ ya kwụọ ụgwọ nʼihi arịrịọ a. 24Ugbu a, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ mere ka m nọgidesie ike nʼocheeze nna m Devid, onye mere ka ọchịchị eze m malite dịka o kwere na nkwa, a ga-eme ka Adonaịja nwụọ taa.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.