Native Bible

1 Kings 14:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-ebu ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche.

1 Kings 14:28 in English

1 Kings 14:28 · Berean Standard Bible

And whenever the king entered the house of the LORD, the guards would bear the shields, and later they would return them to the guardroom.

Context

26O bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo niile ndị ahụ Solomọn kpụrụ. 27Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya. 28Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-ebu ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche. 29Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda? 30Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.