1 Ndị Eze 14:27
1 Kings 14:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya.
1 Kings 14:27 in English
1 Kings 14:27 · Berean Standard Bible
Then King Rehoboam made bronze shields in their place and committed them to the care of the captains of the guard on duty at the entrance to the royal palace.
Context
25Nʼafọ nke ise, nke ọchịchị eze Rehoboam, Shishak, eze Ijipt, busoro Jerusalem agha. 26O bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo niile ndị ahụ Solomọn kpụrụ. 27Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya. 28Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-ebu ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche. 29Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.