1 Ndị Eze 14:25
1 Kings 14:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼafọ nke ise, nke ọchịchị eze Rehoboam, Shishak, eze Ijipt, busoro Jerusalem agha.
1 Kings 14:25 in English
1 Kings 14:25 · Berean Standard Bible
In the fifth year of Rehoboam’s reign, Shishak king of Egypt came up and attacked Jerusalem.
Context
23Ha wukwara nye onwe ha ebe ịchụ aja na ogidi arụsị nʼelu ugwu niile, na ogidi chi Ashera, na nʼokpuru osisi ọbụla akwụkwọ ndụ dị nʼelu ya.* 24E nwere ndị ikom akwụna nʼala ahụ, ndị nọ nʼụlọ arụsị ha dị iche iche. Ndị mmadụ mere ụdị ihe arụ ahụ nke ndị mba niile ndị ahụ na-eme, bụ mba ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼihu ndị Izrel chụpụ. 25Nʼafọ nke ise, nke ọchịchị eze Rehoboam, Shishak, eze Ijipt, busoro Jerusalem agha. 26O bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo niile ndị ahụ Solomọn kpụrụ. 27Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.