Native Bible

1 Kings 14:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo niile ndị ahụ Solomọn kpụrụ.

1 Kings 14:26 in English

1 Kings 14:26 · Berean Standard Bible

He seized the treasures of the house of the LORD and of the royal palace. He took everything, including all the gold shields that Solomon had made.

Context

24E nwere ndị ikom akwụna nʼala ahụ, ndị nọ nʼụlọ arụsị ha dị iche iche. Ndị mmadụ mere ụdị ihe arụ ahụ nke ndị mba niile ndị ahụ na-eme, bụ mba ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼihu ndị Izrel chụpụ. 25Nʼafọ nke ise, nke ọchịchị eze Rehoboam, Shishak, eze Ijipt, busoro Jerusalem agha. 26O bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo niile ndị ahụ Solomọn kpụrụ. 27Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya. 28Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-ebu ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.