1 Ndị Eze 1:51
1 Kings 1:51 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, a gwara Solomọn sị, “Adonaịja na-atụ egwu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya ọ na-ejide mpi ebe nchụaja aka. Ọ na-asị, ‘Ka eze Solomọn ṅụọra m iyi taa sị na ọ gaghị eji mma agha gbuo ohu ya.’ ”
1 Kings 1:51 in English
1 Kings 1:51 · Berean Standard Bible
It was reported to Solomon: “Behold, Adonijah fears King Solomon, and he has taken hold of the horns of the altar, saying, ‘Let King Solomon first swear to me not to put his servant to the sword.’”
Context
49Mgbe ahụ, Adonaịja, na ndị ọbịa ya si nʼebe ha na-eri ihe malie. Onye ọbụla sikwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ, nʼihi ụjọ. 50Ma Adonaịja tụrụ egwu nke ukwuu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya, ọ gara jide mpi dị nʼebe ịchụ aja aka. 51Mgbe ahụ, a gwara Solomọn sị, “Adonaịja na-atụ egwu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya ọ na-ejide mpi ebe nchụaja aka. Ọ na-asị, ‘Ka eze Solomọn ṅụọra m iyi taa sị na ọ gaghị eji mma agha gbuo ohu ya.’ ” 52Solomọn zara sị, “Ọ bụrụ na o gosi onwe ya dịka onye kwesiri ntụkwasị obi, otu agịrị isi dị ya nʼisi agaghị ada nʼala, ma ọ bụrụ na a hụta ihe ọjọọ na nʼaka ya, ọ ga-anwụ.” 53Mgbe ahụ, eze Solomọn, zigara ndị ozi mere ka o site nʼebe nchụaja rịdata. Adonaịja bịara kpọọ isiala nye eze Solomọn. Mgbe ahụ, Solomọn sịrị ya, “Laa nʼụlọ gị.”
1:5 Adonaịja, bụ nwa nke anọ a mụrụ Devid. Ọkpara ya bụ Amọn, Kiliab na Absalọm nwụrụ anwụ, ma Kiliab nwụrụ nʼoge ọ bụ nwantakịrị. 2Sa 3:4
1:7 Zeruaya, bụ nwanne nwanyị Devid.
1:7 Abịata, bụ nwa Ahimelek. 1Sa 22:20
1:33 Ndị ozi nʼụlọeze, a na-ekwu ihe banyere ha nʼebe a, bụ ndị agha eze.
1:38 Ndị Keret na ndị Pelet, bụ ndị nche eze Devid, ndị sitere na mba Kriit na Filistia. 1Sa 30:14; 2Sa 2:18
1:39 Mmanụ a, bụ ụdị mmanụ otiti ahụ Chineke nyere Mosis iwu ka o mee nʼAkwụkwọ Ọpụ 30:22-33
1:39 Ụlọ nzute, bụ ụlọ ikwu ahụ Devid wuru maka i dọba igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Mgbe ahụ, ụlọ nzute ahụ ka dị na Gibiọn. 1Ez 3:4; 2Sa 6:17
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.