1 Ndị Eze 1:50
1 Kings 1:50 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Adonaịja tụrụ egwu nke ukwuu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya, ọ gara jide mpi dị nʼebe ịchụ aja aka.
1 Kings 1:50 in English
1 Kings 1:50 · Berean Standard Bible
But Adonijah, in fear of Solomon, got up and went to take hold of the horns of the altar.
Context
48sị, ‘Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke Izrel onye mere ka m jiri anya m hụ onye nọchiri anya nʼocheeze m taa.’ ” 49Mgbe ahụ, Adonaịja, na ndị ọbịa ya si nʼebe ha na-eri ihe malie. Onye ọbụla sikwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ, nʼihi ụjọ. 50Ma Adonaịja tụrụ egwu nke ukwuu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya, ọ gara jide mpi dị nʼebe ịchụ aja aka. 51Mgbe ahụ, a gwara Solomọn sị, “Adonaịja na-atụ egwu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya ọ na-ejide mpi ebe nchụaja aka. Ọ na-asị, ‘Ka eze Solomọn ṅụọra m iyi taa sị na ọ gaghị eji mma agha gbuo ohu ya.’ ” 52Solomọn zara sị, “Ọ bụrụ na o gosi onwe ya dịka onye kwesiri ntụkwasị obi, otu agịrị isi dị ya nʼisi agaghị ada nʼala, ma ọ bụrụ na a hụta ihe ọjọọ na nʼaka ya, ọ ga-anwụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.