Native Bible

1 Kings 1:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Adonaịja, na ndị ọbịa ya si nʼebe ha na-eri ihe malie. Onye ọbụla sikwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ, nʼihi ụjọ.

1 Kings 1:49 in English

1 Kings 1:49 · Berean Standard Bible

At this, all the guests of Adonijah arose in terror and scattered.

Context

47Ọzọkwa, ndị na-ejere eze ozi abịala ikele onyenwe anyị eze Devid ekele, na-asị, ‘ka Chineke gị mee ka aha Solomọn bụrụ aha a ma ama karịa nke gị, ka ocheeze Solomọn dịkwa ukwuu karịa nke gị.’ Eze nọkwa nʼelu ihe ndina ya kpọọ isiala ofufe, 48sị, ‘Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke Izrel onye mere ka m jiri anya m hụ onye nọchiri anya nʼocheeze m taa.’ ” 49Mgbe ahụ, Adonaịja, na ndị ọbịa ya si nʼebe ha na-eri ihe malie. Onye ọbụla sikwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ, nʼihi ụjọ. 50Ma Adonaịja tụrụ egwu nke ukwuu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya, ọ gara jide mpi dị nʼebe ịchụ aja aka. 51Mgbe ahụ, a gwara Solomọn sị, “Adonaịja na-atụ egwu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya ọ na-ejide mpi ebe nchụaja aka. Ọ na-asị, ‘Ka eze Solomọn ṅụọra m iyi taa sị na ọ gaghị eji mma agha gbuo ohu ya.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.