1 Ndị Eze 1:52
1 Kings 1:52 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Solomọn zara sị, “Ọ bụrụ na o gosi onwe ya dịka onye kwesiri ntụkwasị obi, otu agịrị isi dị ya nʼisi agaghị ada nʼala, ma ọ bụrụ na a hụta ihe ọjọọ na nʼaka ya, ọ ga-anwụ.”
1 Kings 1:52 in English
1 Kings 1:52 · Berean Standard Bible
And Solomon replied, “If he is a man of character, not a single hair of his will fall to the ground. But if evil is found in him, he will die.”
Context
50Ma Adonaịja tụrụ egwu nke ukwuu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya, ọ gara jide mpi dị nʼebe ịchụ aja aka. 51Mgbe ahụ, a gwara Solomọn sị, “Adonaịja na-atụ egwu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya ọ na-ejide mpi ebe nchụaja aka. Ọ na-asị, ‘Ka eze Solomọn ṅụọra m iyi taa sị na ọ gaghị eji mma agha gbuo ohu ya.’ ” 52Solomọn zara sị, “Ọ bụrụ na o gosi onwe ya dịka onye kwesiri ntụkwasị obi, otu agịrị isi dị ya nʼisi agaghị ada nʼala, ma ọ bụrụ na a hụta ihe ọjọọ na nʼaka ya, ọ ga-anwụ.” 53Mgbe ahụ, eze Solomọn, zigara ndị ozi mere ka o site nʼebe nchụaja rịdata. Adonaịja bịara kpọọ isiala nye eze Solomọn. Mgbe ahụ, Solomọn sịrị ya, “Laa nʼụlọ gị.”
1:5 Adonaịja, bụ nwa nke anọ a mụrụ Devid. Ọkpara ya bụ Amọn, Kiliab na Absalọm nwụrụ anwụ, ma Kiliab nwụrụ nʼoge ọ bụ nwantakịrị. 2Sa 3:4
1:7 Zeruaya, bụ nwanne nwanyị Devid.
1:7 Abịata, bụ nwa Ahimelek. 1Sa 22:20
1:33 Ndị ozi nʼụlọeze, a na-ekwu ihe banyere ha nʼebe a, bụ ndị agha eze.
1:38 Ndị Keret na ndị Pelet, bụ ndị nche eze Devid, ndị sitere na mba Kriit na Filistia. 1Sa 30:14; 2Sa 2:18
1:39 Mmanụ a, bụ ụdị mmanụ otiti ahụ Chineke nyere Mosis iwu ka o mee nʼAkwụkwọ Ọpụ 30:22-33
1:39 Ụlọ nzute, bụ ụlọ ikwu ahụ Devid wuru maka i dọba igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Mgbe ahụ, ụlọ nzute ahụ ka dị na Gibiọn. 1Ez 3:4; 2Sa 6:17
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.