Native Bible

1 Corinthians 8:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma onye ahụ hụrụ Chineke nʼanya bụ onye ọ maara.

1 Corinthians 8:3 in English

1 Corinthians 8:3 · Berean Standard Bible

But the one who loves God is known by God.

Context

1Ugbu a, nʼokwu banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị ma na onye ọbụla nwere amamihe. Amamihe na-afụli mmadụ elu mee ka ọ nyaa isi. Ma ịhụnanya na-ewuli elu. 2Ọ bụrụ na ọ dị onye sị na ya maara ihe niile, onye ahụ amatabeghị ihe o kwesiri ịmata. 3Ma onye ahụ hụrụ Chineke nʼanya bụ onye ọ maara. 4Ya mere, ihe banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị maara na “Arụsị abụghị ihe ọbụla nʼụwa”, matakwa na “Chi ọzọ adịghị ma ọ bụghị otu Chineke.” 5A sịkwa na arụsị a na-akpọ chi dị, ma ha nọ nʼeluigwe maọbụ nʼụwa (nʼezie ọtụtụ “chi” na “ndị nwe mmadụ” dị otu a dị).

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.