1 Ndị Kọrint 16:17
1 Corinthians 16:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obi tọrọ m ụtọ nʼọbịbịa nke Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs. Ha emelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nʼebe a.
1 Corinthians 16:17 in English
1 Corinthians 16:17 · Berean Standard Bible
I am glad that Stephanas, Fortunatus, and Achaicus have arrived, because they have supplied what was lacking from you.
Context
15Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ Stefanas bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala Akaịa.* Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi. 16Ana m arịọ unu ka unu na-asọpụrụ ndị dị otu a, nakwa onye ọbụla bụ onye otu anyị na onye ọrụ anyị. 17Obi tọrọ m ụtọ nʼọbịbịa nke Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs. Ha emelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nʼebe a. 18Ha kwalitere mmụọ m dịka ha kwalitere nke unu. Nyenụ ndị dị otu a nsọpụrụ. 19Ụlọ chọọchị niile dị nʼokpuru Eshịa na-ezitere unu ozi ekele.
Akwila na Prisila, na nzukọ dị nʼụlọ ha na-enye unu ekele obiọma nʼime Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.