1 Ndị Kọrint 16:15
1 Corinthians 16:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ Stefanas bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala Akaịa.* Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi.
1 Corinthians 16:15 in English
1 Corinthians 16:15 · Berean Standard Bible
You know that Stephanas and his household were the first converts in Achaia, and they have devoted themselves to the service of the saints. Now I urge you, brothers,
Context
13Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike. 14Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ. 15Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ Stefanas bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala Akaịa.* Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi. 16Ana m arịọ unu ka unu na-asọpụrụ ndị dị otu a, nakwa onye ọbụla bụ onye otu anyị na onye ọrụ anyị. 17Obi tọrọ m ụtọ nʼọbịbịa nke Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs. Ha emelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nʼebe a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.