1 Ndị Kọrint 16:14
1 Corinthians 16:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ.
1 Corinthians 16:14 in English
1 Corinthians 16:14 · Berean Standard Bible
Do everything in love.
Context
12Arịrịọ m nwanne anyị Apọlọs ka o soro ụmụnna ndị ọzọ bịa leta unu, ma ọ bụghị uche ya ma ọlị ịbịakwute unu ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe ọbụla ohere pụtara. 13Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike. 14Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ. 15Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ Stefanas bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala Akaịa.* Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi. 16Ana m arịọ unu ka unu na-asọpụrụ ndị dị otu a, nakwa onye ọbụla bụ onye otu anyị na onye ọrụ anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.