1 Ndị Kọrint 16:13
1 Corinthians 16:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike.
1 Corinthians 16:13 in English
1 Corinthians 16:13 · Berean Standard Bible
Be on the alert. Stand firm in the faith. Be men of courage. Be strong.
Context
11Ka onye ọbụla ghara ileda ya anya. Kama, dupunụ ya nʼije ya nʼudo ka o nwe ike lọghachikwute m. Mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-ele anya nlọta ya. 12Arịrịọ m nwanne anyị Apọlọs ka o soro ụmụnna ndị ọzọ bịa leta unu, ma ọ bụghị uche ya ma ọlị ịbịakwute unu ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe ọbụla ohere pụtara. 13Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike. 14Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ. 15Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ Stefanas bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala Akaịa.* Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.