1 Ndị Kọrint 14:21
1 Corinthians 14:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E dere ya nʼakwụkwọ iwu, “Site na egbugbere ọnụ ndị mba ọzọ sitekwa nʼire ndị na-asụ iche iche ka m ga-agwa ndị a okwu, ma ọbụladị otu a, ha agaghị ege m ntị, ka Onyenwe anyị kwuru.”*
1 Corinthians 14:21 in English
1 Corinthians 14:21 · Berean Standard Bible
It is written in the Law: “By strange tongues and foreign lips I will speak to this people, but even then they will not listen to Me, says the Lord.”*
Context
19Ma mgbe ọbụla a gbakọrọ na nzukọ ife ofufe, ọ na-akara m mma ikwu naanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ niile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nʼasụsụ dị iche iche nke onye ọbụla na-apụghị ịghọta. 20Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nʼechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nʼihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nʼihe gbasara ụdị okwu a. 21E dere ya nʼakwụkwọ iwu,
“Site na egbugbere ọnụ ndị mba ọzọ
sitekwa nʼire ndị na-asụ iche iche
ka m ga-agwa ndị a okwu,
ma ọbụladị otu a, ha agaghị ege m ntị,
ka Onyenwe anyị kwuru.”* 22Ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe nlere anya nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma bụ maka ndị kwere ekwe, ọ bụghị maka ndị na-ekweghị ekwe. 23Ọ bụrụ na nzukọ niile ezukọọ nʼọgbakọ ekpere, mmadụ niile a na-asụ nʼolu dị iche iche nʼotu mgbe, ọ bụrụkwa na ndị na-aghọtaghị, maọbụ ndị na-ekweghị ekwe abata nʼebe ahụ, gịnị ka ha ga-ekwu? Ha ọ gaghị asị na isi emebiela ndị a?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.