1 Ndị Kọrint 14:19
1 Corinthians 14:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mgbe ọbụla a gbakọrọ na nzukọ ife ofufe, ọ na-akara m mma ikwu naanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ niile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nʼasụsụ dị iche iche nke onye ọbụla na-apụghị ịghọta.
1 Corinthians 14:19 in English
1 Corinthians 14:19 · Berean Standard Bible
But in the church, I would rather speak five coherent words to instruct others than ten thousand words in a tongue.
Context
17Ọ bụ ezie na ị na-enye ekele nke ọma, ma ọ naghị ewuli onye ọbụla elu. 18Ana m ekele Chineke nʼihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche* karịa unu niile. 19Ma mgbe ọbụla a gbakọrọ na nzukọ ife ofufe, ọ na-akara m mma ikwu naanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ niile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nʼasụsụ dị iche iche nke onye ọbụla na-apụghị ịghọta. 20Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nʼechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nʼihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nʼihe gbasara ụdị okwu a. 21E dere ya nʼakwụkwọ iwu,
“Site na egbugbere ọnụ ndị mba ọzọ
sitekwa nʼire ndị na-asụ iche iche
ka m ga-agwa ndị a okwu,
ma ọbụladị otu a, ha agaghị ege m ntị,
ka Onyenwe anyị kwuru.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.