1 Ndị Kọrint 14:18
1 Corinthians 14:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m ekele Chineke nʼihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche* karịa unu niile.
1 Corinthians 14:18 in English
1 Corinthians 14:18 · Berean Standard Bible
I thank God that I speak in tongues more than all of you.
Context
16Ma o bụghị otu a, mgbe i ji asụsụ ọzọ nke a na-amaghị na-eto Chineke nʼime mmụọ, olee otu ndị niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amen? 17Ọ bụ ezie na ị na-enye ekele nke ọma, ma ọ naghị ewuli onye ọbụla elu. 18Ana m ekele Chineke nʼihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche* karịa unu niile. 19Ma mgbe ọbụla a gbakọrọ na nzukọ ife ofufe, ọ na-akara m mma ikwu naanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ niile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nʼasụsụ dị iche iche nke onye ọbụla na-apụghị ịghọta. 20Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nʼechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nʼihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nʼihe gbasara ụdị okwu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.