1 Ndị Kọrint 14:16
1 Corinthians 14:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma o bụghị otu a, mgbe i ji asụsụ ọzọ nke a na-amaghị na-eto Chineke nʼime mmụọ, olee otu ndị niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amen?
1 Corinthians 14:16 in English
1 Corinthians 14:16 · Berean Standard Bible
Otherwise, if you speak a blessing in spirit,* how can someone who is uninstructed say “Amen” to your thanksgiving, since he does not know what you are saying?
Context
14Ọ bụrụ na m ji asụsụ dị iche na-ekpe ekpere, mmụọ m ga-eso m na-ekpe ekpere ahụ, ma uche m agaghị aghọta ekpere m na-ekpe. 15Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ihe m ga-eme? Aga m eji mmụọ m kpee ekpere, jirikwa uche kpee ekpere. Aga m ejikwa mmụọ m bụọ abụ, jirikwa uche m bụọ abụ. 16Ma o bụghị otu a, mgbe i ji asụsụ ọzọ nke a na-amaghị na-eto Chineke nʼime mmụọ, olee otu ndị niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amen? 17Ọ bụ ezie na ị na-enye ekele nke ọma, ma ọ naghị ewuli onye ọbụla elu. 18Ana m ekele Chineke nʼihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche* karịa unu niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.