Native Bible

1 Corinthians 13:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe m bụ nwata, ekwuru m okwu dịka nwata, echiche m niile bụ echiche nwata. Izuzu obi m niile bụkwa nke nwata. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịghịkwa m akpa agwa dịka nwata ọzọ.

1 Corinthians 13:11 in English

1 Corinthians 13:11 · Berean Standard Bible

When I was a child, I talked like a child, I thought like a child, I reasoned like a child. When I became a man, I set aside childish ways.

Context

9Nʼihi na ọmụma anyị ezughị oke, ibu amụma anyị ezukwaghị oke. 10Ma mgbe anyị ruru nʼizuoke, ezughị oke agaghị adịkwa. 11Mgbe m bụ nwata, ekwuru m okwu dịka nwata, echiche m niile bụ echiche nwata. Izuzu obi m niile bụkwa nke nwata. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịghịkwa m akpa agwa dịka nwata ọzọ. 12Ugbu a, anyị na-ahụ inyogho inyogho dịka anyị na-ele anya nʼenyo ma mgbe ahụ anyị ga-ahụ ihu na ihu. Ugbu a, ihe m mara ezughị oke, ma mgbe ahụ aga m amazu, dịka m bụ onye a mazuru. 13Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nʼime ha niile, ihe kachasị ha niile bụ ịhụnanya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.