1 Ihe E Mere 7:13
1 Chronicles 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ Naftalị mụtara bụ Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha.
1 Chronicles 7:13 in English
1 Chronicles 7:13 · Berean Standard Bible
The sons of Naphtali: Jahziel,* Guni, Jezer, and Shallum *—the descendants of Bilhah.
Context
11Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ (17,200), ndị nọ na njikere ibu agha. 12Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha. 13Ụmụ Naftalị mụtara bụ
Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha. 14Ụmụ Manase:
Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead. 15Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.