1 Ihe E Mere 7:14
1 Chronicles 7:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ Manase: Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead.
1 Chronicles 7:14 in English
1 Chronicles 7:14 · Berean Standard Bible
The descendants of Manasseh: Through his Aramean concubine, Asriel, as well as Machir the father of Gilead.
Context
12Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha. 13Ụmụ Naftalị mụtara bụ
Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha. 14Ụmụ Manase:
Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead. 15Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom. 16Maaka nwunye Makia mụtara otu nwa nwoke ọ gụrụ Peresh. Aha nwanne ya bụ Sheresh, onye mụtara Ụlam na Rakem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.