Native Bible

1 Chronicles 29:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndịisi ọchịchị niile, na ndịisi Izrel niile, na ụmụ ndị ikom eze Devid niile kwupụtara nrube isi ha nye Solomọn, eze ọhụrụ.

1 Chronicles 29:24 in English

1 Chronicles 29:24 · Berean Standard Bible

All the officials and mighty men, as well as all of King David’s sons, pledged their allegiance to King Solomon.

Context

22Emesịa, ha jiri ọṅụ rie oriri, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha nọkwa nʼebe ahụ nabata Solomọn, nwa Devid dịka eze nke ugboro abụọ, teekwa ya mmanụ nʼihu Onyenwe anyị ka ọ bụrụ onye ọchịchị. Ha mekwara Zadọk onye nchụaja. 23Ya mere, Solomọn nọkwasịrị nʼocheeze Onyenwe anyị dịka eze, nʼọnọdụ nna ya Devid. Ọ bara ụba nke ukwuu. Ndị Izrel rubekwaara ya isi. 24Ndịisi ọchịchị niile, na ndịisi Izrel niile, na ụmụ ndị ikom eze Devid niile kwupụtara nrube isi ha nye Solomọn, eze ọhụrụ. 25Onyenwe anyị mere ka Solomọn dị ukwuu hie nne nʼanya ndị Izrel niile. Ọ yikwasịrị ya ebube nke alaeze nʼụdị ọ dịbeghị eze ọbụla buru ya ụzọ chịa nʼIzrel nweturula. 26Devid nwa Jesi bụ eze ndị Izrel niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.