Native Bible

1 Chronicles 29:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, ha jiri ọṅụ rie oriri, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha nọkwa nʼebe ahụ nabata Solomọn, nwa Devid dịka eze nke ugboro abụọ, teekwa ya mmanụ nʼihu Onyenwe anyị ka ọ bụrụ onye ọchịchị. Ha mekwara Zadọk onye nchụaja.

1 Chronicles 29:22 in English

1 Chronicles 29:22 · Berean Standard Bible

That day they ate and drank with great joy in the presence of the LORD. Then, for a second time, they designated David’s son Solomon as king, anointing him before the LORD as ruler, and Zadok as the priest.

Context

20Mgbe ahụ, Devid gwara ndị Izrel okwu sị, “Toonu Onyenwe anyị Chineke unu!” Ha niile toro Onyenwe anyị Chineke nna ha, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị na eze. 21Nʼechi ya, ha wetara otu puku oke ehi, na otu puku ebule, na otu puku ụmụ ebule jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ. Tinyere aja ihe ọṅụṅụ na ọtụtụ aja ndị ọzọ nʼebe ọ bara ụba nʼihi ụmụ Izrel niile. 22Emesịa, ha jiri ọṅụ rie oriri, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha nọkwa nʼebe ahụ nabata Solomọn, nwa Devid dịka eze nke ugboro abụọ, teekwa ya mmanụ nʼihu Onyenwe anyị ka ọ bụrụ onye ọchịchị. Ha mekwara Zadọk onye nchụaja. 23Ya mere, Solomọn nọkwasịrị nʼocheeze Onyenwe anyị dịka eze, nʼọnọdụ nna ya Devid. Ọ bara ụba nke ukwuu. Ndị Izrel rubekwaara ya isi. 24Ndịisi ọchịchị niile, na ndịisi Izrel niile, na ụmụ ndị ikom eze Devid niile kwupụtara nrube isi ha nye Solomọn, eze ọhụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.