1 Ihe E Mere 29:20
1 Chronicles 29:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Devid gwara ndị Izrel okwu sị, “Toonu Onyenwe anyị Chineke unu!” Ha niile toro Onyenwe anyị Chineke nna ha, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị na eze.
1 Chronicles 29:20 in English
1 Chronicles 29:20 · Berean Standard Bible
Then David said to the whole assembly, “Blessed be the LORD your God.” So the whole assembly blessed the LORD, the God of their fathers. They bowed down and paid homage to the LORD and to the king.
Context
18Ya mere, gị Onyenwe anyị, Chineke nna anyị Ebraham na Aịzik, na Izrel, biko, mee ka ụdị ọchịchọ a dịgide nʼime obi ndị gị ruo ebighị ebi, meekwa ka ha jiri obi ha niile gbasoo gị mgbe niile. 19Nye nwa m Solomọn obi zuruoke nke ọ ga-eji debe iwu gị niile, ọchịchọ gị niile na ụkpụrụ gị niile, ya na mmụọ imezu ihe niile metụtara owuwu ụlọnsọ ukwu a nke m kwadooro ihe niile ndị a.” 20Mgbe ahụ, Devid gwara ndị Izrel okwu sị, “Toonu Onyenwe anyị Chineke unu!” Ha niile toro Onyenwe anyị Chineke nna ha, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị na eze. 21Nʼechi ya, ha wetara otu puku oke ehi, na otu puku ebule, na otu puku ụmụ ebule jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ. Tinyere aja ihe ọṅụṅụ na ọtụtụ aja ndị ọzọ nʼebe ọ bara ụba nʼihi ụmụ Izrel niile. 22Emesịa, ha jiri ọṅụ rie oriri, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ nʼihu Onyenwe anyị.
Ha nọkwa nʼebe ahụ nabata Solomọn, nwa Devid dịka eze nke ugboro abụọ, teekwa ya mmanụ nʼihu Onyenwe anyị ka ọ bụrụ onye ọchịchị. Ha mekwara Zadọk onye nchụaja.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.