1 Ihe E Mere 29:19
1 Chronicles 29:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nye nwa m Solomọn obi zuruoke nke ọ ga-eji debe iwu gị niile, ọchịchọ gị niile na ụkpụrụ gị niile, ya na mmụọ imezu ihe niile metụtara owuwu ụlọnsọ ukwu a nke m kwadooro ihe niile ndị a.”
1 Chronicles 29:19 in English
1 Chronicles 29:19 · Berean Standard Bible
And give my son Solomon a whole heart to keep and carry out all Your commandments, decrees, and statutes, and to build Your palace for which I have made provision.”
Context
17Amaara m, Chineke m, na ị na-anwale obi, na i na-enwekwa mmasị nʼihe ziri ezi. Ihe ndị niile ka m onwe m nyere site nʼafọ ofufu nakwa obi ziri ezi. Ma ugbu a, ahụla m ọṅụ ndị gị, bụ ndị nọ nʼebe a, ji were afọ ofufu nye gị onyinye ha. 18Ya mere, gị Onyenwe anyị, Chineke nna anyị Ebraham na Aịzik, na Izrel, biko, mee ka ụdị ọchịchọ a dịgide nʼime obi ndị gị ruo ebighị ebi, meekwa ka ha jiri obi ha niile gbasoo gị mgbe niile. 19Nye nwa m Solomọn obi zuruoke nke ọ ga-eji debe iwu gị niile, ọchịchọ gị niile na ụkpụrụ gị niile, ya na mmụọ imezu ihe niile metụtara owuwu ụlọnsọ ukwu a nke m kwadooro ihe niile ndị a.” 20Mgbe ahụ, Devid gwara ndị Izrel okwu sị, “Toonu Onyenwe anyị Chineke unu!” Ha niile toro Onyenwe anyị Chineke nna ha, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị na eze. 21Nʼechi ya, ha wetara otu puku oke ehi, na otu puku ebule, na otu puku ụmụ ebule jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ. Tinyere aja ihe ọṅụṅụ na ọtụtụ aja ndị ọzọ nʼebe ọ bara ụba nʼihi ụmụ Izrel niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.