1 Ihe E Mere 29:17
1 Chronicles 29:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Amaara m, Chineke m, na ị na-anwale obi, na i na-enwekwa mmasị nʼihe ziri ezi. Ihe ndị niile ka m onwe m nyere site nʼafọ ofufu nakwa obi ziri ezi. Ma ugbu a, ahụla m ọṅụ ndị gị, bụ ndị nọ nʼebe a, ji were afọ ofufu nye gị onyinye ha.
1 Chronicles 29:17 in English
1 Chronicles 29:17 · Berean Standard Bible
I know, my God, that You test the heart and delight in uprightness. All these things I have given willingly and with an upright heart, and now I have seen Your people who are present here giving joyfully and willingly to You.
Context
15Anyị bụ ndị ọbịa na ndị mbịarambịa nʼihu gị, dịka nna nna anyị ha. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dị ka onyinyo, nke olileanya na-adịghị nʼime ya. 16O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ihe niile ndị a anyị bukọrọ maka iji rụọra gị ụlọnsọ si nʼaka gị bịa. Ha niile bụkwa nke gị. 17Amaara m, Chineke m, na ị na-anwale obi, na i na-enwekwa mmasị nʼihe ziri ezi. Ihe ndị niile ka m onwe m nyere site nʼafọ ofufu nakwa obi ziri ezi. Ma ugbu a, ahụla m ọṅụ ndị gị, bụ ndị nọ nʼebe a, ji were afọ ofufu nye gị onyinye ha. 18Ya mere, gị Onyenwe anyị, Chineke nna anyị Ebraham na Aịzik, na Izrel, biko, mee ka ụdị ọchịchọ a dịgide nʼime obi ndị gị ruo ebighị ebi, meekwa ka ha jiri obi ha niile gbasoo gị mgbe niile. 19Nye nwa m Solomọn obi zuruoke nke ọ ga-eji debe iwu gị niile, ọchịchọ gị niile na ụkpụrụ gị niile, ya na mmụọ imezu ihe niile metụtara owuwu ụlọnsọ ukwu a nke m kwadooro ihe niile ndị a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.