1 Ihe E Mere 29:25
1 Chronicles 29:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị mere ka Solomọn dị ukwuu hie nne nʼanya ndị Izrel niile. Ọ yikwasịrị ya ebube nke alaeze nʼụdị ọ dịbeghị eze ọbụla buru ya ụzọ chịa nʼIzrel nweturula.
1 Chronicles 29:25 in English
1 Chronicles 29:25 · Berean Standard Bible
The LORD highly exalted Solomon in the sight of all Israel and bestowed on him royal majesty such as had not been bestowed on any king in Israel before him.
Context
23Ya mere, Solomọn nọkwasịrị nʼocheeze Onyenwe anyị dịka eze, nʼọnọdụ nna ya Devid. Ọ bara ụba nke ukwuu. Ndị Izrel rubekwaara ya isi. 24Ndịisi ọchịchị niile, na ndịisi Izrel niile, na ụmụ ndị ikom eze Devid niile kwupụtara nrube isi ha nye Solomọn, eze ọhụrụ. 25Onyenwe anyị mere ka Solomọn dị ukwuu hie nne nʼanya ndị Izrel niile. Ọ yikwasịrị ya ebube nke alaeze nʼụdị ọ dịbeghị eze ọbụla buru ya ụzọ chịa nʼIzrel nweturula. 26Devid nwa Jesi bụ eze ndị Izrel niile. 27Ọ chịrị Izrel iri afọ anọ. Ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.