Native Bible

1 Chronicles 27:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Azarel nwa Jeroham bụ onyendu ndị Dan. Ndị a niile bụ ndị ndu ebo Izrel niile.

1 Chronicles 27:22 in English

1 Chronicles 27:22 · Berean Standard Bible

and over Dan was Azarel son of Jeroham. These were the leaders of the tribes of Israel.

Context

20Hoshea nwa Azazaya bụ onyendu ndị Ifrem; Juel nwa Pedaya bụ onyendu ọkara ebo Manase; 21Ido nwa Zekaraya bụ onyendu ọkara ebo Manase nke ọzọ dị na Gilead; Jaasiel nwa Abna bụ onyendu ndị Benjamin; 22Azarel nwa Jeroham bụ onyendu ndị Dan. Ndị a niile bụ ndị ndu ebo Izrel niile. 23Mgbe Devid gụrụ ụmụ Izrel ọnụ. Ọ gụghị ndị gbara site nʼiri afọ abụọ gbadaa ala, nʼihi na Onyenwe anyị kwere nkwa ime ka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel baa ụba dịka kpakpando eluigwe. 24Joab nwa Zeruaya, agụchaghị mmadụ niile ọnụ nʼihi na Chineke tara Izrel ahụhụ nʼihi ịgụ ọnụ a. Ya mere, e denyeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole a gụtara nʼakwụkwọ akụkọ Devid eze Izrel nwere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.