1 Ihe E Mere 27:24
1 Chronicles 27:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Joab nwa Zeruaya, agụchaghị mmadụ niile ọnụ nʼihi na Chineke tara Izrel ahụhụ nʼihi ịgụ ọnụ a. Ya mere, e denyeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole a gụtara nʼakwụkwọ akụkọ Devid eze Izrel nwere.
1 Chronicles 27:24 in English
1 Chronicles 27:24 · Berean Standard Bible
Joab son of Zeruiah began to count the men but did not finish. For because of this census wrath came upon Israel, and the number was not entered in the Book of the Chronicles of King David.
Context
22Azarel nwa Jeroham bụ onyendu ndị Dan.
Ndị a niile bụ ndị ndu ebo Izrel niile. 23Mgbe Devid gụrụ ụmụ Izrel ọnụ. Ọ gụghị ndị gbara site nʼiri afọ abụọ gbadaa ala, nʼihi na Onyenwe anyị kwere nkwa ime ka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel baa ụba dịka kpakpando eluigwe. 24Joab nwa Zeruaya, agụchaghị mmadụ niile ọnụ nʼihi na Chineke tara Izrel ahụhụ nʼihi ịgụ ọnụ a. Ya mere, e denyeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole a gụtara nʼakwụkwọ akụkọ Devid eze Izrel nwere. 25Azmavet nwa Adiel, bụ onye na-elekọta ụlọ ịchịkọta ihe eze.
Ma Jonatan nwa Ụzaya bụ onyeisi ndị na-ahụ maka ụlọ nchịkọta ihe dị nʼakụkụ ala ahụ niile, ma nʼobodo ukwu, ma nʼobodo nta, ma nʼụlọ nche ndị Izrel niile. 26Ezri nwa Kelub bụ onye na-elekọta ubi eze na ndị na-arụ ọrụ nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.