Native Bible

1 Chronicles 26:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya.

1 Chronicles 26:18 in English

1 Chronicles 26:18 · Berean Standard Bible

As for the court * on the west, there were four at the highway and two at the court.

Context

16Shupim na Hosa na-eche ọnụ ụzọ dị nʼọdịda anyanwụ ya na ọnụ ụzọ ama Shaleket nke dị nʼụzọ elu elu. Ndị nche na-esota ndị nche ibe ha. 17Ya mere, ọ bụ ndị Livayị isii na-eche nche nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ụbọchị niile. Mmadụ anọ na-anọ nʼugwu, anọ na ndịda, abụọ nʼebe a na-achịkọbata ihe. 18Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya. 19A họpụtara ndị nche ndị a site nʼikwu Kora na Merari. 20Ụfọdụ ndị Livayị ka e nyefere ọrụ ilekọta ụlọakụ, na ụlọ a na-echekọta onyinye niile e doro nsọ nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Chineke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.